Abụ Ọma 5

Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.

Psalm 5:11 (UKJV) But let all those that put their trust in you rejoice: let them ever shout for joy, because you defend them: let them also that love your name be joyful in you.

9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.

10Maa ha ikpe, Chineke. Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha. Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha, nʼihi na ha enupula isi megide gị.

11Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.

12Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume. Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.