3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela
6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.