4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela
6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.