14O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
15Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
17Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.