16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
17Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
19Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
20Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”