Abụ Ọma 83

Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.

Psalm 83:16 (UKJV) Fill their faces with shame; that they may seek your name, O LORD.

14Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,

15si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.

16Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.

17Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.

18Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.