12ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
13O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
14Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
15si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
16Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.