3Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
4Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”
5Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,
6ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga,
7na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.