Abụ Ọma 83

Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.

Psalm 83:3 (UKJV) They have taken crafty counsel against your people, and consulted against your hidden ones.

1O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.

2Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.

3Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.

4Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”

5Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.