14naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.
16Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu; bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.