1Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
2A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
3Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?