10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.
12Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.