1Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa, ya na ndịisi kwesiri ntụkwasị obi, ndị ga-ekpe ikpe ziri ezi.
2Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.
3Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe.
4Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta, ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma.
5Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.