13Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
14Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
15mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.
16“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m.
17Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?