54Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ.
55Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị.
56Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi.
57O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.
58Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.