56Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi.
57O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.
58Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.
59Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.
60Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.