1Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m tulee ịsụ ude m.
2Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m, gị Chineke onye bụ eze m. Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.
3Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
4Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.