7Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m.
8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
9Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.